Psalms 67

Abụ Ọma dịrị onyeisi abụ. Abụ eji ụbọ akwara akpọ. Abụ Ọma. Otu Abụ.

Abụ ekele

1Ka Chineke meere anyị amara ma gọzie anyị,
ma mee ka ihu ya chakwasị anyị, a Sela
2Ka a mara ụzọ gị niile nʼụwa,
marakwa nzọpụta gị nʼetiti mba niile.

3Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;
ka mmadụ niile too gị.
4Ka mba niile ṅụrịa ma bụọ abụ ọṅụ,
nʼihi na ị na-eji ikpe ziri ezi na-achị ndị mmadụ,
na-edukwa mba niile nke ụwa. Sela
5Ka mmadụ niile too gị, O Chineke;
ka mmadụ niile too gị.

6Mgbe ahụ, ala ga-amịpụta ihe owuwe ubi ya,
Chineke, onye bụ Chineke anyị, ga-agọzikwa anyị.
7Chineke ga-agọzi anyị,
nsọtụ niile nke ụwa ga-atụ egwu ya.
Copyright information for IboBIU